Ada Success bụ aha a ma ama na facebook nakwa ọgbakọ soshal midia ndị ọzọ. Ihe e ji mara ya bụ ikwu okwu na-atọ ọchị, nke na-eme ka ndị mmadụ chee na ọ bụ okenye. Mana nwaada a gbara naanị afọ ise.